Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 14:3 - Bible Nso

3 Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 14:3
23 Iomraidhean Croise  

Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!


O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na miri-iyi ahu takọrọ, n'ihi na miri-ozuzo adighi n'ala.


Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya;


Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.


Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.


Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe, Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.


Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.


N'ihi ala nke b͕awara ab͕awa, n'ihi na oké miri-ozuzo adighi n'ala, ihere emewo ndi-ọlu-ubi, ha ekpuchiwo isi-ha.


N'ìhi gini ka ihe-nb͕um digidere mb͕e nile? n'ìhi gini ka ntiputa-ọnyám nādighi ngwọta? ọ juwo ka agwọta ya. Ì gāburum nání ihe di ka miri-iyi nārafu arafu, dika miri na-ekwesighi ntukwasi-obi?


N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.


Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.


Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.


Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere.


Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku: Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.


ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;


Ọzọ, agu Gi nāgu anu ọhia nile: n'ihi na ebe nile miri si erù atasiwo, ọku eripiawo kwa ebe-ita-nri nile nke ọzara.


Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu.


Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan