Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 14:16 - Bible Nso

16 Ọzọ, ndi ahu nke ha onwe-ha nēburu amuma gābu ndi anētufu n'èzí nile nke Jerusalem n'ihi oké unwu na mma-agha; ọ dighi kwa onye nēlì ozu ha gēnwe, ha onwe-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom: n'ihi na M'gāwukwasi ha ihe ọjọ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 14:16
23 Iomraidhean Croise  

Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.


Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi.


Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda.


Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.


N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha.


Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha.


N'ihi na eziteghm ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ma ha onwe-ha nēbu amuma ugha n'aham; ka M'we chupu unu, unu ewe la n'iyì, unu onwe-unu na ndi-amuma ndi nēburu unu amuma.


Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n'ihi na ọ di ilu, n'ihi na o rutuwo obi-gi aru.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.


Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gēkpoputa ọkpukpu ndi-eze Juda, na ọkpukpu ndi-isi-ya, na ọkpukpu ndi-nchu-àjà, na ọkpukpu ndi-amuma, na ọkpukpu ndi bi na Jerusalem, n'íhì-ha:


ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.


Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.


Kwue, si, Otú a ka ihe nke si n'ọnu Jehova puta siri, Ozu madu gāda dika ǹsí-anu n'ọhia, na dika nju-aka ọka n'azu onye nēwe ihe-ubi, ọ dighi kwa onye nāchikọta ha.


Ọ bu kwa ndi ganalu ọlu mb͕e nile ka ha gēkewaputa, ndi ganāgabiga n'ala-ha nēlì ndi-ngabiga ahu, bú ndi fọduru n'elu ala, ime ka ọ di ọcha: n'ọgwugwu ọnwa asa ka ha gāchọputa.


n'ihi nka ka Jehova siri otú a: Nwunye-gi ganākwa iko n'obodo, umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom gāda kwa site na mma-agha, agēji kwa eriri kèsa ala-gi; gi onwe-gi gānwu kwa n'ala ruru árú, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.


M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan