Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 14:14 - Bible Nso

14 Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n'aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 14:14
32 Iomraidhean Croise  

Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.


Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.


Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha.


Hananaia we kwue okwu n'anya ndi Israel nile, si, Otú a ka Jehova siri: Ọbuná otú a ka M'gāb͕ajipu yoke nke Nebukadneza, bú eze Babilon, n'olu mba nile tutu ogologo arọ abua eruzue. Jeremaia, bú onye-amuma, we la.


Je, gwa Hananaia okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Nkpọrọ osisi ka i b͕ajiworo; ma i mewo nkpọrọ ígwè n'ọnọdu ha.


Jeremaia, bú onye-amuma, we si Hananaia, bú onye-amuma, Biko, nuru, Hananaia; Jehova eziteghi gi; ma gi onwe-gi emewo ka ndi nka tukwasi okwu-ugha obi.


Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n'aham, si: Le, M'gaje inye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n'anya-unu;


Zigara ndi nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, si, Okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere Shemaia onye-Nehelamait, si: N'ihi na Shemaia ebuworo unu amuma, ma Mu onwem eziteghi ya, o we me ka unu tukwasi okwu-ugha obi;


Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


N'ihi nka ka M'gāchiri nwunye-ha nye ndi ọzọ, were kwa ubi nile ha nye ndi gēnweta ha: n'ihi na site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-àjà onye ọ bula nēme ihe n'ugha.


Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.


Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu; Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata: Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.


Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.


N'ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n'etiti ulo Israel.


Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma, gi si ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta, Nurunu okwu Jehova;


n'ihi nka unu agaghi-ahu kwa ọhù efu ọzọ, unu agaghi-aju kwa ase ọzọ: M'gānaputa kwa ndim n'aka-unu; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.


Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.


N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.


Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n'ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n'aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma.


Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.


site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha;


Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan