Ma gi onwe-gi, ekpela ekpere bayere ndi nka, ebuli-kwa-la iti-nkpu na ikpe-ekpere bayere ha: n'ihi na M'gaghi-nānu olu-ha na mb͕e ha nākpokum n'ihi ihe ọjọ ha.
Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.