Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 13:24 - Bible Nso

24 M'gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 13:24
19 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.


I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.


Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.


M'gāchusa kwa ha n'etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M'gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia.


Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim: Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam: Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.


Ma ndi-ya nile ndi b͕alagara ab͕alaga n'usu-ndi-agha-ya nile gāda site na mma-agha, ndi fọduru gāb͕asa-kwa-ra ifufe nile ọ bula: unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.


Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.


Ma M'gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n'etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n'ala nile.


N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


tutu ukpuru amuputa nwa, (ubọchi agabigawo dika ib͕ob͕o-ọka), mb͕e ọnuma nke iwe Jehova akābiakwasighi unu, mb͕e ubọchi iwe Jehova akābiakwasighi unu.


Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.


Jehova gēme kwa ka i b͕asa n'etiti ndi nile, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n'ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume.


Asiwom, M'gāfupu ha, Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:


Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan