Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 13:19 - Bible Nso

19 Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n'ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n'ala ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 13:19
21 Iomraidhean Croise  

Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Eze we me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


Ewe de Israel nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu; ma, le, edere ha n'akwukwọ ndi-eze Israel: ma emere ka Juda je biri na Babilon n'ihi nmekpu ha mekpuru.


Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.


Ha gēsi kwa n'obodo nile nke Juda, si kwa n'ebe nile di Jerusalem buruburu, si kwa n'ala Benjamin, si kwa n'ebe di ala ala, si kwa n'ugwu, si kwa na Negeb, bia, nēwebata ihe àjà-nsure-ọku, na àjà ọzọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, nēwebata kwa ekele, n'ulo Jehova.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n'anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M'gēnye n'aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.


Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.


ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon.


Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb, na n'ala Benjamin, na n'ebe nile nke di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, ka ìgwè ewu na aturu gāgabiga kwa ọzọ n'okpuru aka abua nke onye nāgu ha ọnu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ndi Israel nke fọduru, bú ndi fọduru n'obodo ahu, na ndi dapuru adapu, bú ndi dapuru jekuru ya, na ndi Israel fọduru, bú ndi fọduru n'ebe ahu, ndia ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ha je biri na Babilon.


Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Ewe me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


Nka bu ndi ahu nke Nebukadreza mere ka ha je biri n'ala ọzọ; n'arọ nke-asa nnù ndi-Ju asa na ọgu iri-na-otù na atọ:


n'arọ nke-orú-na-atọ nke Nebukadreza ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ndi-Ju ufọdu, bú nnù madu na ọgu iri-na-asa na ise, je biri n'ala ọzọ: madu nile di nnù iri na otù na ọgu iri.


Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù; Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike: Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.


Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala?


Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru.


Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.


Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan