Jeremaya 12:6 - Bible Nso6 N'ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n'azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị. Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.