Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 12:3 - Bible Nso

3 Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 12:3
23 Iomraidhean Croise  

Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.


Chinekem, ama-kwa-ram na Gi onwe-gi nānwaputa obi, izi-ezi nātọ kwa Gi utọ. Mu onwem, n'izi-ezi obim ka m'were afọ-ofufo nye Gi ihe nile ndia: ma ub͕u a ndi-gi, ndi ahutara n'ebe a, ewerewom ọṅù hu ha ka ha nēwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ha.


N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.


Jehova n'anwa onye ezi omume: Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.


Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile:


I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè.


Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.


Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.


Gi mara, Jehova: chetam, letakwam, we bọ̀rọm ndi nēsob͕um ọ́bọ̀; ewepulam n'eweghi-iwe-ọsọsọ nke Gi: mara na eburuwom ita-uta n'ihi Gi.


Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.


Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.


Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpém.


Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n'anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n'ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.


Ha gāda kwa, buru ndi eb͕uru eb͕u, n'ala ndi Kaldea, na ndi adupuru adupú, n'èzí-ya nile.


Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri.


Unu biri n'oké oriri na ọṅuṅu n'elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n'ubọchi ob͕ub͕u.


Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n'ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n'ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan