Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 12:2 - Bible Nso

2 I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 12:2
15 Iomraidhean Croise  

Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè, Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke: Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.


Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.


Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.


Onye-nwe-ayi we si, N'ihi na ndi nka abiaruwo nso n'ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n'ebe M'nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n'iwu nke emere ka ha muta:


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n'ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n'ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n'ikpasum iwe n'isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ma ọbuná n'ihe a nile nwa-nne-ya nwayi nke nāghọb͕u, bú Juda, ejighi obi-ya nile laghachikutem, kama o ji okwu-ugha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M'wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M'kuworo n'ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.


Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;


Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha; Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.


Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.


Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan