Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 12:17 - Bible Nso

17 Ma ọ buru na ha anughi, M'gēropu kwa mba ahu, nēropu ya nēme kwa ka ọ la n'iyì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 12:17
15 Iomraidhean Croise  

Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.


N'ihi na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè gi gāla n'iyì; e, aghaghi ime ka mba ahu nile tọb͕ọrọ n'efu.


N'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n'iyì;


Ọ gēru kwa na, dika M'muworo anya n'aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n'iyì, na imejọ; otú a ka M'gāmu anya n'aru ha iwu ulo na iku ihe n'ubi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.


Ma mb͕e o guzoro ọtọ, agētipia ala-eze-ya, kesa ya na nchere-iru ifufe anọ nke elu-igwe; ma ọ gaghi-adiri umu-ya gānọchi ya, ọ gaghi-adi kwa ka ala-ọchichi-ya nke ọ chiri si di; n'ihi na agēropu ala-eze-ya, ọ gādi-kwa-ra ndi ọzọ nābughi ndia.


M'gēropu kwa Asherim-i n'etiti gi: M'gēkpochapu kwa ndi-iro-gi nile.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.


nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan