Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 11:5 - Bible Nso

5 ka M'we me ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru nna-unu-hà, inye ha ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya, dika o si di ta. M'we za, si, Amen, Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 ‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.” Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 11:5
16 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.


O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka.


Otú a ka M'gēme ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa ndi bi ya, ọbuná ime obodo a ka ọ di ka Tofet:


o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n'ala ọzọ, si na Babilon lata n'ebe a.


I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya;


Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Ma emeghi otú a, onye nọ n'ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu?


I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan