Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 10:22 - Bible Nso

22 Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n'ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 10:22
16 Iomraidhean Croise  

Ogwu gēpú kwa n'ulo-elu-ya nile, akuba na ọhia-ogwu n'ebe-ya nile ewusiri ike: o we ghọ ebe-obibi nkita-ọhia, ogige nke diri enyi-nnunu.


Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka.


N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.


Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi na otù olu nēgosi site na Dan, ọ nēme kwa ka anuru ajọ ihe site n'ugwu Efraim:


Bulienu ọkọlọtọ n'uzọ Zaion: latanu n'ulo ọsọsọ, unu eguzola: n'ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n'Ugwu bia, ya na ntipia uku.


Hezoa gāghọ kwa ebe-obibi nkita-ọhia, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu rue mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Le, anameme ka otù mba si n'ebe di anya biakwasi unu, ulo Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta:) mba di ike ka ọ bu, mba nke sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka ọ bu, ọ bu mba nke i nādighi-ama asusu-ya, nke I nādighi-anu kwa ihe ha nēkwu.


Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.


Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n'ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.


M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi.


Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà; Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:


i gāsi kwa ndi ala nka, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere ndi bi na Jerusalem, baye-kwa-ra ala Israel, si: Nri-ha ka ha gēwere ncheb͕u rie, miri-ha ka ha gēwere kwa iju-anya ṅua, ka ala-ya we tọb͕ọrọ n'efu ghara inwe ùjú-ya, site n'ihe-ike nke ndi nile bi nime ya.


ma Isọ ka M'kpọworo asì, me ugwu-ya nile ka ha ghọ ebe tọḅọrọ n'efu, M'were ihe-nketa-ya nye nkita-ọhia nile nke ọzara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan