Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 10:13 - Bible Nso

13 mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O mee ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 10:13
23 Iomraidhean Croise  

Ma osisi ntà ọ bula nke ọhia akādighi n'uwa, ihe-ọkukú ọ bula nke ọhia akēpughi kwa: n'ihi na Jehova, bú Chineke, akēmeghi ka miri zo n'elu uwa, ọ dighi kwa madu di ilu ọlu ubi;


Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.


Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,


I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri: Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.


Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti; Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha.


Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.


Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe, Onye nēdoziri ala miri-ozuzo, Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.


Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.


Bùkuenu Onye ahu Nke elu-igwe kachasi elu-igwe nile, nke di mb͕e ochie, nēbu dika inyinya; Le, Ọ nēme ka olu-Ya da udà, ọ bu olu ike.


Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt.


Ọ̀ di ihe ọ bula n'etiti ihe-efu nile nke mba nile nke nēme ka miri zo? ma-ọbu elu-igwe, hà gēnye oké miri-ozuzo? ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Onye ahu, Jehova, bú Chineke-ayi? ayi gēle kwa anya Gi; n'ihi na Gi onwe-gi emewo ihe ndia nile.


Otú a ka M'gēme ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa ndi bi ya, ọbuná ime obodo a ka ọ di ka Tofet:


Ha asighi kwa n'obi-ha, Biko, ka ayi tua egwu Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēnye oké miri-ozuzo, ma nke-mbu ma nke-ikpe-azu, na mb͕e-ya; ízù nile akara àkà nke owuwe-ihe-ubi ka Ọ nēdebere ayi.


mb͕e Ọ nēme ka olu-Ya da, ùzù miri di n'elu-igwe, O we me ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà, Ọ nēme kwa ka ifufe si n'olu-nkwakọba-Ya nile puta.


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan