Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 1:7 - Bible Nso

7 Jehova we sim, Asila, Nwata ka m'bu: n'ihi na ọ bu onye ọ bula M'gēzì gi ka i gējekuru, ọ bu kwa ihe ọ bula M'genye gi n'iwu ka i gēkwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 1:7
20 Iomraidhean Croise  

Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m'gēkwu.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata.


Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m'gēkwu.


na Jehova gwara Moses okwu, si, Mu onwem bu Jehova: gwa Fero eze Ijipt okwu nile nke Mu onwem nāgwa gi.


Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.


O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile,


I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.


I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.


Ma mb͕e M'nākpayere gi uka, M'gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Jehova we wepum n'iso ìgwè ewu na aturu, O we sim, bú Jehova, Je, buere ndim, bú Israel, amuma.


Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi.


Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.


Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan