Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 1:13 - Bible Nso

13 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ite afunwuworo ọku n'okpuru ya ka m'nāhu; iru-ya site-kwa-ra n'Ugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 1:13
10 Iomraidhean Croise  

Ma ihe kpatara eji me ka nrọ ahu di okpukpu abua nye Fero, ọ bu n'ihi na emewo ka okwu ahu guzosie ike site n'ebe Chineke nọ, Chineke nēme kwa ngwa ime ya.


otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya.


Jehova we sim, Gini ka onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Fig; ndi bu ezi fig di nma nke-uku; ma ndi bu fig ọjọ jọrọ njọ nke-uku, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.


ndi nāsi, Mb͕e iwu ulo adighi nso: obodo nka bu ite, ayi onwe-ayi bu kwa anu.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta.


N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ dighi okwu ọ bula n'okwum nile agēme kwa ka ọ di anya ọzọ, ma okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


O we si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Otù nkata nke nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru. Jehova we sim, Ọgwugwu abiaruwo ndim, bú Israel, aru; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ya ọzọ.


O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan