Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.
Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu?
Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.