Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 9:20 - Bible Nso

20 Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 9:20
15 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we zipu ya n'ubi Iden ab͕ara ogige, ilu ọlu ala ahu nke esiri na ya weputa ya.


Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi.


ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n'ọlu, bú nke putara n'ala Jehova buworo ọnu.


Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.


ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya.


Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu: Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.


Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.


N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;


Ọzọ, njubiga-ókè nke ala, ọra madu ka ọ diri: ọbuná eze ka ubi nēfè òfùfè.


Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.


Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu?


Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.


I gēkwe nkwa ilu nwunye, ma ya na nwoke ọzọ gēdina: i gēwu ulo, ma i gaghi-ebi nime ya: i gāku ubi-vine, ma i gaghi-eme ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan