Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 9:19 - Bible Nso

19 Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 9:19
8 Iomraidhean Croise  

Ma ndia bu osuso-ọmumu umu-ndikom Noa, bú Shem na Ham na Jefet: amukwara ha umu-ndikom, mb͕e iju-miri ahu gasiri.


Noa we b͕a nnù arọ na ọgu ise: Noa we mua Shem, na Ham, na Jefet.


Anu nile ọ bula nke di ndu nke gi na ya nọ, bú nke sitere n'anu-aru nile, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime ihe nile nākpu akpu nke nākpu akpu n'uwa, gi me ka ha so gi puta; ka ha we nuputa n'uwa, mua ọmùmù, ba uba n'elu uwa.


Chineke we gọzie Noa na umu-ya ndikom, si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa.


Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine:


Unu onwe-unu kwa, muanu ọmùmù, banu uba; nuputanu umu n'uwa, ba uba nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan