Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 9:15 - Bible Nso

15 M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 9:15
14 Iomraidhean Croise  

Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.


na n'ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n'ihe nile nēsi n'ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa.


M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.


Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu,


ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe di n'elu, ma-ọbu n'elu uwa di n'okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi:


Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.


O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.


I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.


Elelìla ayi, n'ihi aha-Gi; akpọla oche-eze nke ebube-Gi ihe-nzuzu: cheta, emebila ọb͕ub͕a-ndu-Gi ayi na Gi b͕ara.


Ma Mu onwem gēcheta ọb͕ub͕a-ndu Mu na gi b͕ara n'ubọchi mb͕e i di na nwata, M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi guzosiere gi ike.


Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;


I gāmara kwa na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu Chineke; Chineke ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, nēdebere ndi huru Ya n'anya, ndi nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere-Ya rue nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan