Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 9:13 - Bible Nso

13 eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 9:13
5 Iomraidhean Croise  

Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n'etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi:


Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu,


Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.


M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;


Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan