Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 8:20 - Bible Nso

20 Noa we wuere Jehova ebe-ichu-aja, were ufọdu nime anu-ulo nile ọ bula di ọcha na nime anu-ufe nile ọ bula di ọcha, sure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-aja ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 8:20
27 Iomraidhean Croise  

Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


rue ọnọdu nke ebe-ichu-aja ahu nke ọ mereri n'ebe ahu na mbu: Abram we kpọkue aha Jehova n'ebe ahu.


Ọ si, Biko, were nwa-gi nwoke nke i nwere nání ya, onye i huru n'anya, bú Aisak, je ala Moraia; sure ya n'ebe ahu, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu otù nime ugwu ahu nke M'gāsi gi je.


Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku.


Ọ we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n'ebe ahu: ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri.


O guzo ebe-ichu-àjà ọtọ n'ebe, ahu, kpọ ya, El-elohe-Israel.


Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi.


O wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n'iru nwa-nne-ya.


Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma:


Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n'anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya;


ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile.


anu nile ọ bula nke di ndu, ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, na anu-ufe nile ọ bula, ihe ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, dika ab͕uru-ha si di, ha siri n'ub͕ọ pua.


O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.


Moses we si, Gi onwe-gi gēnye kwa n'aka-ayi ihe àjà, na ihe àjà-nsure-ọku, ka ayi we mere Jehova, bú Chineke-ayi, ihe.


I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.


I gānara kwa ha n'aka-ha, sure ha ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu, ka ha buru ihe ísì utọ n'iru Jehova: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.


na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;


Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.


Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta.


ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan