Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 8:2 - Bible Nso

2 e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n'elu-igwe;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 8:2
10 Iomraidhean Croise  

N'arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n'ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe.


Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.


Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri? Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri?


Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe? Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha,


Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu: Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:


N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim.


N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan