5 Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.
5 Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.
Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.
Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di.
Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere.
Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.
Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.
Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya.
Ma Ọ zara, si ha, Nnem na umu-nnem bu ndia ndi nānu okwu Chineke, nēme kwa ya.
Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.
Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.
ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.
ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n'ahuhu nile Ọ huru;