Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 7:4 - Bible Nso

4 N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 7:4
23 Iomraidhean Croise  

Ma osisi ntà ọ bula nke ọhia akādighi n'uwa, ihe-ọkukú ọ bula nke ọhia akēpughi kwa: n'ihi na Jehova, bú Chineke, akēmeghi ka miri zo n'elu uwa, ọ dighi kwa madu di ilu ọlu ubi;


Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa.


Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume.


Jehova we si, Mọm agaghi-achi achi nime madu rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na ya onwe-ya bu kwa anu-aru: ma ubọchi-ya nile gābu ọgu arọ isi.


Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha.


O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa.


Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


Iju-miri ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n'elu uwa bulie ya elu.


ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile.


Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n'ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ;


Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ, zipu nduru ahu; ma ọ laghachikuteghi ya ọzọ ma-ọli.


e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n'elu-igwe;


Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi, Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:


Imere ifufe ihe-ọtùtù; Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.


Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu, Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje isi n'elu uwa zilaga gi: n'arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n'ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova.


Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu.


Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M'gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M'gēkwuputa kwa aha-ya n'iru Nnam, na n'iru ndi-mọ-ozi-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan