Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 7:3 - Bible Nso

3 ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n'elu uwa nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 7:3
6 Iomraidhean Croise  

Nime anu-ufe di iche iche, na nime anu-ulo di iche iche, nime ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu n'ala, abua abua n'aha nile ọ bula gābiakute gi, idebe ha ndu.


Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n'anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya;


N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.


Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala,


Noa we wuere Jehova ebe-ichu-aja, were ufọdu nime anu-ulo nile ọ bula di ọcha na nime anu-ufe nile ọ bula di ọcha, sure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-aja ahu.


ihe-árú ka ha gābu-kwa-ra unu; unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu gāgu kwa ozu-ha n'ihe-árú.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan