Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 7:21 - Bible Nso

21 Anu-aru nile nke nākpu akpu n'elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, na madu nile ọ bula:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 7:21
20 Iomraidhean Croise  

Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma.


Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa.


Ma Mu onwem, le, anameme ka iju-miri biakwasi uwa, ibibi anu-aru nile, nke ume nke ndu di nime ya, ka ọ pua n'okpuru elu-igwe; ihe nile nke di n'uwa gēkubi ume.


N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.


Anu-aru nile gēkubìkọ ume, Mdu gālaghachi kwa n'ájá.


Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n'ọnọdu-ya.


N'ihi nka ka ọb͕ub͕a-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe: n'ihi nka ka ndi bi n'uwa reworo ọku, madu ole-na-ole we fọdu.


N'ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu.


N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha.


M'gēkpochapu madu na anumanu; M'gēkpochapu anu-ufe nke elu-igwe, na azù nke oké osimiri, na ihe-isu-ngọngọ nile, ha na ndi nēmebi iwu; M'gēbipu kwa madu n'elu uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.


Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n'iyì.


N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya;


N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.


asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan