N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.
M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.
Mb͕e m'rigoro n'ugwu inara mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova b͕ara nye unu, m'we nọdu n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru.