22 Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.
22 Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.
Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n'ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n'etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n'anu-aru nke apí-ha n'otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka.
Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.
Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.
abua abua bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu.
Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.
Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n'elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.
o webata ib͕e ahu n'ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
o we sure n'elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu.
mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, na mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso, ha we sa aru: dika Jehova nyere Moses iwu.
Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.
O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, je ala Israel.
Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.
Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.
Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.