Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 6:11 - Bible Nso

11 Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 6:11
22 Iomraidhean Croise  

Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova.


Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.


Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet.


Jehova we si Noa, Ba n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n'ihi na gi ka M'huworo bu onye ezi omume n'irum n'ọb͕ọ a.


n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Jehova n'anwa onye ezi omume: Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì.


Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa: Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.


Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha: N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.


Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, rida; n'ihi na ndi-gi, nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, ebibiwo onwe-ha:


Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.


Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n'irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.


Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n'ihe-ike, i we mehie: M'we me ka i si n'ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M'we me ka i la n'iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n'etiti nkume ọku.


O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? Ọ̀ buru ulo Juda ihe di nfe ime ihe-árú nile nke ha meworo n'ebe a? n'ihi na ha emejuwo ala-ha n'ihe-ike, we chigharia ikpasum iwe; ma, le, ha nēsetipu alaka rue imi-ha.


Jehova, rùe ole mb͕e ka m'ganētiku Gi, ma I dighi-anu? m'nētiku Gi nkpu, si, Ihe-ike! ma I dighi-azọputa.


N'ihi na ihe-ike emere Lebanon gēkpuchi gi, na nbibi nke anumanu di iche iche, nke mere ka ha tua ujọ; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.


N'ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.


Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta.


n'ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n'ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:


Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:


N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu.


O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan