Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 50:23 - Bible Nso

23 Josef we hu umu Efraim nke umu-umu nke-atọ: amu-kwa-ra umu Makia nwa Manase n'ikperè abua nke Josef.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 50:23
11 Iomraidhean Croise  

Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.


Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile.


Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine, Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.


Josef we biri n'Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri.


Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:


Job we di ndu mb͕e ihe a gasiri ọgu arọ asa, o we hu umu-ya, na umu umu-ya, bú ọb͕ọ anọ.


Hu kwa umu nke umu-gi gāmu. Ka udo dikwasi Israel.


Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu; Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.


Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.


Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.


Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan