Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 50:21 - Bible Nso

21 Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 50:21
13 Iomraidhean Croise  

Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi.


Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu.


Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.


Josef we biri n'Ijipt, ya onwe-ya, na ulo nna-ya. Josef we di ndu ọgu arọ ise na iri.


Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;


N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.


Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.


ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.


Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan