Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 50:11 - Bible Nso

11 Ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, we hu oruru-újú ahu n'ebe-nzọcha-ọka nke Atad, ha si, Nka buru ndi Ijipt oruru-újú di arọ́: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Ebel-Mizraim, nke di n'ofè Jọdan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 50:11
10 Iomraidhean Croise  

Ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n'ala ahu mb͕e ahu.


Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n'ebe ahu.


Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n'imem ka m'sì ísì n'etiti ndi bi n'ala nka, n'etiti ndi Kenean, na n'etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m'nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m'tọb͕ọrọ n'efu, mu onwem na ulom


Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.


Umu-ya ndikom we mere ya otú a dika ọ nyere ha iwu:


Ugwu ndia, hà adighi n'ofè Jọdan, n'azu uzọ ọdida-anyanwu, n'ala ndi Kenean ndi bi n'Araba, na ncherita-iru Gilgal, n'akuku osisi terebinth nke More?


Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon.


Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka.


òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan