Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 50:10 - Bible Nso

10 Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 50:10
16 Iomraidhean Croise  

Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem.


Ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, we hu oruru-újú ahu n'ebe-nzọcha-ọka nke Atad, ha si, Nka buru ndi Ijipt oruru-újú di arọ́: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Ebel-Mizraim, nke di n'ofè Jọdan.


Ewe debezuere ya ọgu ubọchi abua: n'ihi na otú a ka anēdebezu ubọchi ndi anāb͕asì ozu-ha: ndi Ijipt we kwara ya ákwá ọgu ubọchi atọ na iri.


Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si.


Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku.


Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:


Nwunye Uraia we nu na Uraia, bú di-ya, anwuwo, o we tiere di-ya aka n'obi.


ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n'okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.


Ha na ya we nānọko n'ala ubọchi asa ehihie na abali, ma ọ dighi onye nāgwa ya okwu; n'ihi na ha huru na o nēb͕u ya nb͕u nke-uku.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa:


Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.


Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá.


Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n'ofè Jọdan n'ọzara, n'Araba ahu na ncherita-iru Suf, n'etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab.


Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue.


Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan