Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 5:5 - Bible Nso

5 Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 5:5
21 Iomraidhean Croise  

n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua.


ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.


Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:


ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.


N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.


N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.


Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya, Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah


Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.


ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:


ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.


N'ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n'ihi na echezọwo ncheta-ha.


Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi.


Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.


ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n'aru Ya: n'ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.


Dika ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan