21 Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela:
21 Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua.
Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
nwa Metusela, nwa Inok, nwa Jered, nwa Mahalaleel, nwa Kenan,
Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ:
Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,