Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 49:8 - Bible Nso

8 Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi: Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi; Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 49:8
38 Iomraidhean Croise  

Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.


Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.


Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.


Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul.


Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.


Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.


Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel.


Ma Jehova, bú Chineke Israel, rọputaram n'etiti ulo nile nke nnam ibu eze Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na Juda ka Ọ rọputara ibu onye-ndú; ma n'ulo Juda Ọ rọputara ulo nnam; ma n'etiti umu-ndikom nnam ihem tọrọ Ya utọ imem ka m'buru eze Israel nile:


N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)


Esa nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu ọta uku na ube, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri ndi sitere na Juda; na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise ndi sitere na Benjamin, bú ndi nēbu ọta, nāzọgide kwa uta ikwe ha: ndia nile bu ndi-dike bu dìnkpà.


Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n'etiti ha site n'Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n'ihi na ha siri n'Israel dayere ya n'uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya.


O we tiye usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'ala Juda, na n'obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were.


Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n'Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem.


Onye amaworo na Juda ka Chineke bu: N'Israel ka aha-Ya di uku.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.


ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.


Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.


Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera.


Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.


Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si, Jehova, nu olu Juda, Me kwa ka ọ bakute ndi-ya: Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù; Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.


nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua.


N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.


O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.


Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.


Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan