Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 49:3 - Bible Nso

3 Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem; Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 “Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 49:3
17 Iomraidhean Croise  

Lia we turu ime, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Reuben: n'ihi na ọ siri, N'ihi na Jehova elekwasiwo nweda-n'alam anya; n'ihi na ub͕u a dim gāhum n'anya.


O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya. Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:


umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:


Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n'Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben.


Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya.


Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;


Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di.


umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.


O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.


O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt, Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:


N'akuku ókè-ala Efraim, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Reuben, otù òkè.


Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu:


kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.


ndia gēguzo kwa n'ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali.


Ka Reuben di ndu, ghara kwa inwu; Ma ka ndikom-ya di ole-na-ole.


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan