Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 49:27 - Bible Nso

27 Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 49:27
25 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.


Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad.


Ngọzi nile nke nna-gi Adiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murum Rue ókè nke ugwu ebighi-ebi: Ha gādi n'isi Josef, Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.


Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha.


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n'etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n'etiti ya.


Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.


Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.


Nke umu Benjamin, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum, Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya: Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara, Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.


Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.


Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n'etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādighi kwa aghughọ dika nduru.


Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.


Mu onwem matara na mb͕e m'lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n'etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere;


Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n'ulo nile n'otù n'otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n'ulo-nkpọrọ.


Ma Sọl, ebe ọ nēwere iba-nba na ob͕ub͕u ku ume megide ndi nēso uzọ Onye-nwe-ayi rue ub͕u a, o jekuru onye-isi-nchu-àjà,


O kwuru ihe bayere Benjamin, si, Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya; O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.


ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi;


Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n'etiti Israel n'ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.


Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan