2 Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob; Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
2 “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.
Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem; Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.
Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu.
Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ, Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?
Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:
Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu, Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
Nwam, debe okwu-ọnum nile, Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ.
Ma ub͕u a, umum, genum nti, Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum.
Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.
Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.