Le, dika anya ndi-orù si elekwasi aka ndi-nwe-ha, Dika anya abua nke nwayi nēje ozi si elekwasi aka nwayi nwere ike n'aru ya; Otú a ka anya-ayi nēlekwasi Jehova, bú Chineke-ayi, Rue mb͕e Ọ gēmere ayi amara.
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.
Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.
Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.
Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.
Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus.
Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya.