16 Dan gēkpeputa ndi-ya, Dika otù nime ebo nile nke Israel.
16 “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.
Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma, Hu kwa ala ahu, na ọ di uto; Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu, We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
Ka Dan buru agwọ n'uzọ, Aju-ala n'okporo-uzọ, Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru, Onye o nēbu we daghachi azu.
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
O we kwue ihe bayere Dan, si, Dan bu nwa ọdum, Ọ nēsi na Beshan maputa.
Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa.
Ọ we kpe Israel ikpe na mb͕e ndi Filistia orú arọ.