Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 48:20 - Bible Nso

20 Ọ we gọzie ha n'ubọchi ahu, si, Nime gi ka Israel gāgọzi, si, Chineke me gi ka i di ka Efraim, ka i di kwa ka Manase: ọ we do Efraim n'iru Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị, “Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a, ‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ” Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 48:20
13 Iomraidhean Croise  

Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.


Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche:


Israel we si Josef, Le, mu onwem gaje inwu: ma Chineke gānọyere unu, me kwa ka unu lata n'ala nna-unu-hà.


Nke diri ebo Josef, nke ahu bu, nke diri ebo Manase, bu Gadi nwa Susi.


Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua.


Nke diri ebo Efraim bu Hoshia nwa Nun.


N'ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso:


N'ubọchi nke-asatọ onye-isi umu Manase nwere, bú Gameliel nwa Pedahzua, wetara ihe-ya nso:


Mb͕e Jekob nānwu anwu, ọ bu okwukwe ka o ji gọzie umu-ndikom Josef n'otù n'otù; kpọ kwa isi ala nye Chineke, nādabere n'isi nkpa-n'aka-ya.


Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan