Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 48:17 - Bible Nso

17 Josef we hu na nna-ya nātukwasi aka-nri-ya n'isi Efraim, ọ we jọ njọ n'anya-ya: ọ we welie aka nna-ya, iwepu ya n'isi Efraim tiye n'isi Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 48:17
13 Iomraidhean Croise  

Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n'anya Aisak nna-ya;


Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.


Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n'isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n'isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n'ihi na Manase bu ọkpara.


Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya.


Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.


Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.


Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya, O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.


Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.


Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n'ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n'uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-gi, m'gālaghachi n'onwem.


n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ,


Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.


Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan