Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 48:14 - Bible Nso

14 Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n'isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n'isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n'ihi na Manase bu ọkpara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 48:14
24 Iomraidhean Croise  

Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'chezọ ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu na ulo nile nke nnam.


Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.


Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.


Josef we chiri ha abua, Efraim n'aka-nri-ya n'ebe aka-ekpe Israel di, na Manase n'aka-ekpe-ya n'ebe aka-nri Israel di, ọ we me ka ha biakute ya nso.


Josef we hu na nna-ya nātukwasi aka-nri-ya n'isi Efraim, ọ we jọ njọ n'anya-ya: ọ we welie aka nna-ya, iwepu ya n'isi Efraim tiye n'isi Manase.


Josef we si nna-ya, Ọ bughi otú a, nnam: n'ihi na nka bu ọkpara; tukwasi aka-nri-gi n'isi-ya.


Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.


Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.


Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di n'akuku Ọdida-anyanwu: onye-isi umu Efraim nwere bu Elishama nwa Amihud.


i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha:


Ewerewokwam ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel.


Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike.


Mb͕e ahu ekutara Ya umu-ntakiri, ka O we bikwasi ha aka-Ya abua, kpe kwa ekpere: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.


O we bikwasi ha aka-Ya abua, si n'ebe ahu pua.


Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n'ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n'ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.


O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto.


Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.


Mb͕e ahu, mb͕e ha busiri ọnu kpe kwa ekpere bikwasi kwa ha aka n'isi, ha we zipu ha.


ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi.


Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu.


Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n'ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n'isi nke ndi bu okenye, nye gi.


Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan