Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 48:12 - Bible Nso

12 Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Josef sitere nʼikpere Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 48:12
15 Iomraidhean Croise  

o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,


Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala,


Abraham we bilie, kpọ isi ala nye ndi ala ahu, bú umu Het.


Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso.


Ma Josef, ya onwe-ya bu onye-isi ala ahu: ya onwe-ya bu onye nēre ọka nye ndi ala ahu nile: umu-nne Josef we bia, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ha n'ala.


Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi.


Josef we chiri ha abua, Efraim n'aka-nri-ya n'ebe aka-ekpe Israel di, na Manase n'aka-ekpe-ya n'ebe aka-nri Israel di, ọ we me ka ha biakute ya nso.


Bat-sheba we bakuru eze, bú Solomon, igwa ya okwu bayere Adonaija. Eze we bilie izute ya, we kpọ isi ala nye ya, nọkwasi n'oche-eze-ya, dọbara nne eze oche-eze; o we nọdu n'aka-nri-ya.


O we ba nime, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala, kuru nwa-ya, pua.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Moses we me ngwa, rube isi-ya n'ala, kpọ isi ala.


Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.


Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n'ihi na nka bu ihe ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan