Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 46:34 - Bible Nso

34 na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ anụ ụlọ site na mgbe anyị bụ ụmụnta, dịka nna nna anyị ha bụ.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ekwe ka unu biri nʼala Goshen. Nʼihi na ndị niile na-azụ ewu na atụrụ bụ ndị akpọrọ asị nʼala Ijipt.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 46:34
17 Iomraidhean Croise  

Ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n'ala ahu mb͕e ahu.


Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu.


Ndi-ọzùzù anu-ulo Gera we so ndi-ọzùzù anu-ulo Aisak nēse okwu, si, Ọ bu ayi nwe miri ahu: ọ kpọ aha olùlù-miri ahu Isek; n'ihi na ha chọrọ ya okwu.


O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom;


Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n'ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara.


Umu-nne ya we je izù ìgwè ewu na aturu nke nna-ha na Shekem.


Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha.


Ha we dọkwasiri ya nke ya iche, dọkwasikwara ha nke ha iche, dọkwasi-kwa-ra ndi Ijipt nke ha iche, bú ndi ya na ha nērikọ ihe: n'ihi na ndi Ijipt apughi isoro ndi-Hibru rie nri; n'ihi na ihe-árú ka nke ahu buru ndi Ijipt.


i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:


chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m'nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka.


ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo.


Josef we me ka nna-ya na umu-nne-ya biri n'ala, ọ nye kwa ha ihe-onwunwe n'ala Ijipt, n'ebe kachasi nma nke ala ahu, n'ala Rameses, dika Fero nyere iwu.


Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà.


Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen.


ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.


M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa.


Moses we si, O kwesighi ime otú a; n'ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n'anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan