Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 46:12 - Bible Nso

12 Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ụmụ ndị ikom Juda bụ, Ịa, na Onan, na Shela, na Perez, na Zera. Ma Ịa na Onan nwụrụ nʼala Kenan. Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 46:12
29 Iomraidhean Croise  

Ọ turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke: ọ we si, Na mb͕e a ka m'gēkele Jehova: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Juda; ọ we kwusi imu nwa.


Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.


Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.


Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.


Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.


Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari.


Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron.


Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;


Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel;


Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal.


Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia;


N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)


Utai nwa Amihud, nwa Ọmri, nwa Imri, nwa Bani, onye sitere n'umu Perez nwa Juda.


Ndi sitere n'umu Zera; Jeuel, na umu-nne-ha, nnù madu na ọgu iri-na-anọ na iri.


Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n'umu Zera nwa Juda, nọ kwa n'aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.


Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.


Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab.


Nka bu kwa ngọzi nke Juda: ọ we si, Jehova, nu olu Juda, Me kwa ka ọ bakute ndi-ya: Aka-ya abua aluworo ya onwe-ya ọ̀gù; Onye-iye-aka megide ndi nākpab͕u ya ka I gābu.


N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.


otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.


Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.


ka ulo-gi di kwa ka ulo Perez, onye Tema muru nye Juda, site na nkpuru nke Jehova g=enye gi site na nwa-ab͕ọghọ a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan