Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 45:10 - Bible Nso

10 i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 45:10
12 Iomraidhean Croise  

na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.


Josef we ba, gosi Fero, si, Nnam na umu-nnem, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, esiwo n'ala Kenean bia; ma, le, ha nọ n'ala Goshen.


Josef were nri zùa nna-ya, na umunne ya, na ulo nile nke nna-ya, dika ọnu-ọgugu nke umu-ntakiri si di.


Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen.


ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.


N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.


M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa.


Nání n'ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi.


Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.


Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan