Ọ welie anya-ya abua, hu Benjamin nwa-nne-ya, bú nwa nke nne-ya, ọ si Ọ̀ bu nka bu nwa-nne-unu nke-ntà, onye unu gwaram okwu banyere ya? Ọ we si, Ka Chineke mere gi amara, nwam.
Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata?
Ayi we si onye-nwem, Ayi nwere nna, bú agadi, na otù nwa agadi-ya, bú onye ntà; nwa-nne-ya anwuruwo kwa, ọ we fọdu nwata ahu nání ya nye nne-ya, nna-ya hukwara ya n'anya.