Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 44:16 - Bible Nso

16 Juda we si, Gini ka ayi gāsi onye-nwem? gini ka ayi gēkwu? àyi gēsi kwa aṅa gu onwe-ayi na ndi ezi omume? Chineke achọputawo ajọ omume ndi-orù-gi: le, ayi aghọworo onye-nwem ndi-orù, ma ayi onwe-ayi ma onye ahu nke achọta-woro ọkwa ahu n'aka-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ya mere Juda sị ya, “Gịnị ka anyị ga-ekwu? Olee otu anyị ga-esi gosi nʼaka anyị dị ọcha? Chineke ekpugheela ikpe ọmụma ndị ohu gị. Lee, anyị bụkwa ndị ohu onyenwe m. Anyị onwe anyị, tinyekwara onye a chọtara iko ahụ nʼaka ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 44:16
25 Iomraidhean Croise  

ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem.


Ọ we rọ kwa nrọ ọzọ, kọrọ ya umu-nne-ya, si, Le, arọwom nrọ ọzọ; ma, le, anyanwu na ọnwa na kpakpando iri na otù nākpọ isi ala nyem.


Ọ si, Ya burum ihe-árú ime nka: nwoke ahu achọtaworo ọkwa ahu n'aka-ya, ọnye ahu gāghọrọm orù; ma unu onwe-unu, rigo-kurunu nna-unu n'udo.


N'ihi na orù-gi nọrọ nwa-okoro ahu mbe n'ebe nnam nọ, si, Ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, eme-hiewokwam megide nnam ubọchi ndum nile.


Onye ọ bula n'etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n'aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù.


Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n'ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n'iwu,


Jehova, bú Chineke Israel, onye ezi omume ka I bu; n'ihi na ayi fọduru ibu ndi-nb͕apu, dika o si di ta: le, ayi nọ n'iru Gi n'ikpe-ọmuma-ayi; n'ihi na ọ dighi onye iguzo n'iru Gi n'ihi nka.


Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum.


Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.


Madu nke ọbara madu nānyib͕u, Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.


N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.


Ma ub͕u a, unu ndi bi na Jerusalem na ndi Juda, biko, kpenu ikpe n'etiti mu na ubi-vine nkem.


Onye-nwe-ayi, Gi ka ezi omume diri, ma ayi ka ihere iru diri, dika o si di ta; ọ diri ndi Juda, di-kwa-ra ndi bi na Jerusalem, di-kwa-ra Israel nile, ma ndi nọ nso, ma ndi nọ n'ebe di anya, n'ala nile ebe I chugaworo ha, n'ihi nmekpu-ha nke ha mekpuru Gi.


Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


Ma ọ dighi ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi, nke anāgaghi-ekpughe: ọ dighi kwa ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-ama.


Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?


Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu;


Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.


o we me ka ulo-ya biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Ekan, nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda.


Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan