Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 43:34 - Bible Nso

34 Ewe si n'iru ya butere ha onyinye nri: ma onyinye nri Benjamin kariri onyinye nri ha nile ub͕o ise. Ha we so ya ṅu ihe-ọṅuṅu, we ṅujue afọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 O sitekwara na nri e doziri ya nyebinye ha nri. Nri e nyere Benjamin dị ukwuu okpukpu ise karịa nri nke e nyere ha niile. Ha na ya riri, ṅụọkwa nʼuju.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 43:34
12 Iomraidhean Croise  

umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:


Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.


Devid we si Uraia, Rida n'ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n'ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n'azu.


Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:


N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.


Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.


Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.


N'ihi na, le, M'gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.


Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile.


si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.


ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan